Ulo Nzuko Omebe Iwu Enugu State Akwadola Atumatu Iwu Megidere Oke Ego Ugwo Ulo Na State A
Written by admin on November 17, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo nzuko omebe iwu Enugu State House of Assembly akwadola atumatu iwu ejiri choo ichekwa ndi bina ulo onye ozo amara dika tenants megide usoro ojo ibugoro ha ugwo ulo oge nakwa otu obuna omasiri ndi nwe ulo na State a.
Nke a putara ihe taata bu Tuesday na ogige Hallowed Chamber yabu ulo nzuko dina mpaghara 3 Arms Zone nke Independence Layout na isi obodo Enugu oge atumatu iwu a gafechara nguputa nke ugboro ato ya.
Yabu atumatu iwu mere ya ka oburu iwu na obu ma afo ano gacha ka ndi nwe ulo nwere ike ikpatughari aka mbugo ego ulo gaara ndi bina ulo ha na State a, ma buru mbugo na agaghi agafere per cent abuo na ime ego ulo ndi ahu bina ulo ha na akwu.
Atumatu iwu a nyeziri ohere ihe na agaghi agafere per cent iri na mbugo ugwo ulo ma ogatacha afo ano obuna gaara ndi nke ahu ruru olu nruzighari putara ihe nke oma na ulo ha.
Na ogbako ndi omebe iwu ahu taata ka obu onye na anochite ogbonta vote Nkanu West State Constituency bu Hon Iloabuchi Aniagu kpolitere atumatu okwu ejiri kwado atumatu iwu a, ebe Hon Jane Eneh nke ogbonta vote Awgu North State Constituency churu ya aja na ukwu, dika Hon Okey Mbah nke Nkanu East State Constituency buru uzo nye nkowa olu otu committee ulo nzuko ahu lebara anya na ya.
Na okwu ya ka enwechara nririta uka ejiri kwado atumatu iwu a ka onu na ekwuru ulo nzuko ahu bu Rt Hon Uche Ugwu kowara nke a dika otu na ime ezi ochichi di ugbu a na State a, ebe omere ka amata na iwu a ma Gov Peter Ndubuisi Mbah binyecha ya aka ga enye ezi onodu ume ndu gaara ndi bina ulo na State a.
