Agbaputala Simon Ekpa Na Ulo Nga Mba Finland

Written by on November 17, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Onye ahu ruburu olu dika onye okaiwu nyere Mazi Nnamdi Kanu nke otu Indigenous People of Biafra IPOB bu Barr Alloy Ejimakor emela ka amata na atoghapugo otu na ime ndi ahu welitere isi na izo maka nnwere onwe Biafra bu mazi Simon Ekpa bukwanu onye aturu nga na mba Finland.

Barr Ejimakor mere ka nke a puta ihe taata bu Tuesday na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ohaneze ma buru nke ulo akwukwo akuko Punch Newspaper biputara na ehihe taata.

Okowara na onwetara ozi ntoghapu a site na onu enyi ma buru onye noo nso gaara yabu Simon Ekpa bu onye onyere aha ya dika David Matsanga.

Na nke ya ka onye Deputy Prime Minister nyere otu ochichi akporo Biafra Govt in Exile bu Ngozi Orabueze gara na iru gosiputa onyonyo ebe yana Simon Ekpa nakwa umu afo Nigeria ozo no ka esicha na yabu ulo nga toghapu ya.

Iga echetazi na obu na onwa November afo 2024 ka aka ndi nchekwa mba Finland kpatara nwa amadi a maka ebubo agwa ojo metutara agha nkusu, ebe ulo ikpe mba ahu noro na onwa September afo 2025 tuo ya nga afo isii, ma buru nga emechara noro na onwa October afo a bu 2026 belata ka oburu afo ano site na ulo ikpe mkpeghari.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited