Ihe Mberede Okporo Uzo Mere Na Ogun State Akpala Ike Ojo Na State Ahu

Written by on November 23, 2026

by Maduabuchi Onwe

Ihe mberede okporo uzo mere na etiti ugboala truck ato na uzo awara awara ahu siri Lagos gawa Ibadan na Ogun state atala isi otu onye na state ahu.

Yabu ihe mberede okporo uzo ka ozi mere ka amata na omere kpom kwem na ncherita iru ulo olu ndi uwe oji Ashabi police station unya bu uka oge oji nkeji iri na abuo wee gafeta elekere asaa nke mgbede.

Nke a putara ihe site n’onu onye mmekorita ohaneze nyere ulo olu Ogun State Traffic Complaince and Enforcement Agency TRACE bu Babatunde Akinbiyi n’ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Monday.

N’ikpeazu ka onye huru Ka yabu ihe siri wee mee mere ka amata na ihe butere yabu ihe mberede okporo uzo bu igba wam wam na okporo uzo.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited