Iko Egwuregwu 2025 AFCON: Ulo Ikpe CAS Ebughachiela Nturu Ugo Gaara Mba Senegal
Written by admin on November 24, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo ikpe egwuregwu amara dika Court of Arbitration for Sports CAS akabiela ikpe ma kagbuo mkpebi ahu otu Confederation of African Football CAF jiri napu mba Senegal nturu ugo iko ala isi oji nke 2025 Africa Cup of Nations AFCON yabu mba Senegal nwetara na onwa January afo a bu 2026.
Iga echeta na mba Senegal ji otu okpu goal merie mba Morocco na nke ikpeazu ya na yabu asompi iko AFCON, mana otu CAF mechara tugharia mmeri a gaara mba Morocco ibute yabu iko.
Ka osiladi, taata bu Tuesday ka ulo ikpe CAS weputara nkabi ikpe ya na akwukwo ikpe mkpeghari mba Senegal gbara, ma mee ka amata na ndi okaikpe mmadu ato lebara anya na ikpe mkpeghari a choputara na ezia na obu mba Senegal nwetara nturu ugo na asompi egwuregwu ahu.


