Aka Na Achi Enugu State Eturula Ugo Governor Kachasi Eme Nke Oma Na South East
Written by admin on March 23, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu na abughi nke govt amara dika Hall of Igbo Achievers Foundation HIAF ekwuputala aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah dika onye turu ugo onyinye nrite governor kachasi mee nke oma na afo 2025 gara aga na mpaghara South East dika osiri di na nke izizi otu a na achikoba usoro nturu ugo a.
Nke a putara ihe site na ozi onye Chief Executive Officer yabu otu HIAF ma burukwa Editor-in-Chief nke Igbo Book of Records bu Nze Sam Nwanze nyefere ndi nta akuko bukwanu ebe onoro kowa na eguzobere otu mejuputara na mmadu asaa nke obu Most Rev Dr Emmanuel Chukwuma lagoro ezum ike na okwa nnukwu ukochukwu nzuko nso Anglican na Enugu noro na isi ha bu ndi mere nnyocha ma choputa Gov Peter Mbah dika governor kachasi mee nke oma maka yabu onyinye nturu ugo.
Nze Nwanze gwara ndi nta akuko na ngalaba ndi ahu aka na achi Enugu State kachasi mee nke oma gunyere: aruike, mmuta, njem, nchekwa, okporo uzo, mmepe imime obodo nakwa obodo ndi mepere emepe gunyere ngalaba ndi ozo.
Nze Nwanze sitere na ozi a nke obu onye Executive Director yabu otu HIAF ma buru Executive Editor, Igbo Book of Records bu Mike Ubani binyere aka kowa na Gov Mbah ji ihe banyere mmuta kporo mkpa nke ukwuu na ochichi ya ma elegara anya na ibugo ego nzube olu gaara yabu ngalaba ma buru nke mere ojiri ruputa ulo akwukwo Smart Green Schools di nari abuo na iri isii na onumara Ward niile enwere na State a.
Okowaziri na yabu aka na achi Enugu State noro na ederede letter nnabata nturu ugo a kene otu HIAF maka ihuta ya ama na ebe opuru iche ma kowa nke a dika nke gazuru ndi niile na enyere ya aka na ochichi ibugo State a na ogogo ka mma.
Yabu onye Chief Executive Officer otu HIAF kwuputaziri na obuna ogbako ga ewere onodu na abali iri na isii nke onwa ozo bu April na ogige International Conference Centre ICC ma okuo elekere iri na abuo nke ehihe ka aga enyefe Gov Mbah nturu ugo a na ozuzu oke ya.
Okowara na aga anorokwu na ogbako a nyefe umu afo Igbo di iri abuo na otu nturu ugo opuru maka mbo ha.
Na oge ona akowa na otu HIAF bu nke eguzobere maka nkwalite omenala na odibendi Igbo ka Nze Sam Nwanze nyere aha ufodu na ime ndi ozo ahu aga enye onyinye nturu ugo dika: onye isi oche otu jikoro ndi eze odinala na State a bu HRM Igwe Samuel Asadu, Prof Umeh Okafor, onye Chief Medical Director ulo ogwu Enugu State Teaching Hospital dina Nsukka nakwa otutu ndi ozo, ebe aga anorokwu na ogbako a chee na iru ohaneze agba nke abuo ya akwukwo Igbo Book of Records nakwa akwukwo akuko Igbo Digest Newspaper.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.