Aka na achi Enugu State mere ka amata na State a so n’ime States nwere ezi nchekwa na ala anyi a.

Written by on June 20, 2025

Aka na achị Enugu State bu Governor Peter Ndubuisi Mbah, mere ka amata na State a so n’ime States nwere ezi nchekwa na ala anyi a, na agbanyeghị okwu asi ụfọdụ ndị mmadụ na ekwugasi.

Governor Mbah kwuru na State a weputagasiri ezi atụmatụ ma tinye oke ya n’ebe ọdị ukwu iji weta ogbugbo nyere ndị omekome ma nyekwa ha ntaramahụhụ ruru ha.

Governor Mbah mere nkea puta ihe n’oge ọ nabatara Assistant Inspector General of Police na elekota Zone 13, bu AIG Abayomi Oladipo na Obi government State a ụnya bu Wednesday.

Governor Mbah kwuru na ya ma na ọchịchị ya agaghi akwalite uto akụ n’ụba State a site n’ọnụ ego dị anọ ijeri dollar anọ ruo ijeri dollar iri atọ, ma dewe ya dika ebe eji ego achu nta ego, ebe azụmahịa, ebe ana eme njem ngaghari anya ma biri n’enweghị nchekwa, ya mere oji nwe mkpebi na mbụ itinye ego na enweghi nchekwa na State a.

Ọ gbakwụnyere na ọtụtụ akụrụngwa nchekwa dịka Command and Control Centre, iguzobe Distress Response Squad, bu ngalaba ndị uweojii pụrụiche, nwere ụgbọala ihe karịrị otu narị na iri ise, tinyere igwefoto AI na enyere aka na mpaghara dị iche iche na State a maka nleba anya, nakwa akụrụngwa ndị ọzọ etinyere, ọ gara n’iru mee ka amata na Enugu nwere ikike igbochi mpụ ma dozie ha mgbe ha mere.

N’okwu ya na mbụ, AIG Oladipo, kwuru na ya enwetala ozi gbasara nchekwa site n’aka Commissioner ndị uweojii na State a bu CP Mamman Giwa, nakwa ogbo ya na Anambra State, bu CP Ikioye Orutugu, ma wepụta usoro maka ijikọ aka ọnụ lụso mpụ ọgụ, toro Governor Mbah maka ezi ọrụ ya n’ebe ọgbasara nchekwa nke ndụ ndị mmadụ nakwa ihe ha nwere na State a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited