Aka Ndi Uwe Ojii Akpatala Puku Kwuru Puku Ndi Ekperima Na Enugu State
Written by admin on March 12, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State anorola na otu afo kpata mmadụ di puku ise, nari asato, iri iteolu na ise ana enyoenyo na agwa ekperima di ichiche na State a.
Habu ndi uwe ojii gakwara na iru naputa ndi danyere na onya ojo ndi ntori di otu nari, iri isii na asato na akuku di ichiche na State a.
Ihe ndi a putara ihe na ubochi Wednesday na ogige Police Command’s Headquarters dina isi obodo Enugu site na onu Commissioner habu ndi uwe ojii State a bu CP Mamman Bitrus Giwa na okwu ogwara ndi nta akuko banyere imerube otu afo onogoro na okwa kemgbe abali iri na otu nke onwa March afo 2025 ezitere ya State a.
CP Giwa kowara na mnwuchiko habu ndi ana enyoenyo na agwa ekperima ka ndi uwe ojii mere site na njiko aka na olu ndi nchekwa ozo na State a.
Yabu onye isi ndi uwe ojii koro ndi nta akuko na ndi a aka kpatara gunyere: otu nari, iri ano na asato ana ebo ebubo maka iji egbe gaa ori, ndi nke di otu nari, iri abuo na iteolu maka ntori, ebe ndi nke di otu nari, iri ise na asato ka ana enyoenyo maka igbu mmadu, dika mmadu di iri ano na asato ka anwuchikoro maka ebubo iji ngwa ogu na uzo megidere iwu, mmadu iri ato na iteolu aburu ndi ana enyoenyo na ima mmadu elu na ike, ebe aka kpatara mmadu di nari abuo na iri maka otu nzuzo nakwa mgbere ogwu ike.
CP Mamman Bitrus Giwa kwuputara na ndi ozo foro afo di puku ise, otu nari, iri isii na ato ka anwuchikoro maka agwa ekperima ndi gunyere ori, ntisa akuluba, igwu ojoro, itu mgbere mmadu nakwa ikuka ulo ndi mmadu na ike.
Na ikpeazu ka yabu Commissioner ndi uwe ojii na Enugu State nuru iyi iga na iru na mbo ya ikpochapu ndi ekperima kpamkpam na State a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.