AKOWALA UZO KA MMA MAKA NJEM AWELE OKPORO UZO NA OGE MMEME CHRISTMAS NAKWA NKE AFO OHURU

Written by on December 9, 2024

Ayiola ndi okpu ugboala ka ha gbado anya nke oma na ihe banyere nleta ezi onodu ugboala ha tupu ha ebuputa ha na okporo uzo, iji zeere ihe mberede okporo uzo ana adi na ahutakari okachasi na oge mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru na akpudobe nso.

Ayiyo a putara ihe na ngwucha izu uka anyi puru na ime ya oge ngalaba akuko uwa anyi kpoturu ufodu ndi ji isi obodo Abia State bu Umuahia mere ebe obibi maka ntunye oke ha nyere mbelata ihe mberede okporo uzo na udi oge nkwadebe mmeme a na akpudobe nso.

Otu na ime ha bu mazi James Obinna kporo oku ka ndi okpu ugboala jiri nleta ezi onodu ugboala ha kwa ubochi kporo mkpa, iji huna ha kpatuchara aka nke oma na ebe ndi ahu kwesiri ekwesi tupu ha ebubputa habu ugboala na okporo uzo.

Na nke ha ka mazi Chidiebere Chinedu nakwa Fred Chukwuka bucha ndi okpu ugboala na Umuahia kowara ezi nleta ugboala tupu ebuputa ha na okporo uzo dika uzo ka mma iji chekwa ndu na akuluba ndi mmadu megide ihe mberede okporo uzo na oge mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru ana abanye na ime ya.

Ha kporo oku kpogara ndi odi na aka bu ihe banyere nleta ugboala ka ha jiri olu ha kporo mkpa site na idi na ejichi mana amachikwa ugboala ndi ahu na anoghi na ezi onodu tupu ebuputa ha na okporo uzo.

Ndi ozo yoro ndi okpu ugboala ka ha zeere oke wawawa na okporo uzo mana enwekwa nrube isi na iwu niile na achikwa njem okporo uzo, okachasi na oge mmeme a.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies