Anaputala Umuaka Abuo Ndi Ntori Mmadu Toro Na Ebonyi State Kpoga Anambra State

Written by on April 2, 2026

by Maduabuchi Onwe

Otu oru nchekwa amara dika Anambra state special Anti-touting Squad SASA anaputala umuaka abuo ndi ntori mmadu toro na ime obodo Umuezeokoha nke Ezza North LGA na Ebonyi state na odi nso a.

Habu umuaka abuo gbara afo ato nakwa afo ise ka ozi mere ka amata na atoro kpom kwem na okpuru ochichi ime obodo Ezza North nke state ahu.

Nke a putara ihe site na ozi onye isi oche yabu otu oru nchekwa SASA bu Chief Monday Nwokoye nyefere ndi nta akuko na ubochi Tuesday na Ebonyi state dika ha kpoghachitere umuaka ahu azu na aka ndi nne na nna ha na yabu state.

Ogakwara na iru mee ka amata na ha nwuchiri yabu onye otu mgbere mmadu enyere aha ya dika Sunday Nonye na otu ulo oriri na onunu dina Nkpor nke Anambra state ebe onoo wee na eche ndi na abia igoro umuaka ahu.

Na ikpazu ka ha mere ka amata na yabu onye otu mgbere mmadu nozi na aka ngalaba na ahu maka ime nnyocha gbasara agwa ekperima amara dika criminal investigation department CID maka ime ya nnyocha nke oma.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited