Ben Nwoye Ekwuputala Mmasi Ya Na Okwa Osote Onye Isi Oche Izugbe Otu Ndorondoro APC Na Nigeria
Written by admin on March 9, 2026
by Chidimma Kama
Nwa amadi ahụ jitopụrụ ọkwa onye ịsị oche ochichi nchere oge otu ndọrọndọrọ All Progressives Congress APC na Enugu State bụ Dr. Ben Nwoye, ekwupụtala ya kpọmkwem ebumnuche ya ipụta zoọ ọkwa Deputy National Chairman yabu otu ndorondoro maka ndida ugwu ala anyi n’ọgbakọ APC National Convention n’abịa n’iru.
Dr Nwoye mere ka nkea pụta ihe n’oge ndi nta akuko na amịrị ya okwu n’ọnụ ụnya bụ ụka, dịka o mekwara ka amata ndị ịsị nke usoro mgbasa ozi ya, ebe akpọlitere Timothy Amah dịka Director General mgbasa ozi ya, ma enyefee ọkwa Directors gara geopolitical zones ịsịị, gụnyere otu ndị ntorobịa nakwa ụmụ nwaanyị.
Nwoye mekwara ka amata na ụlọ ọrụ mgbasa ozi ha nọ ọrụ na Abuja k’ọdị ugbua, dịka ọ kọwara na ha dị njikere irụrụ otu ndọrọndọrọ APC ọrụ ma gba mbọ hụ na President Bola Ahmed Tinubu pụtara nke ugboro abụọ ya tinyekwara ndị ọzọ jị ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ahụ azọ ọkwa ọchịchị.
Ọ gakwara n’iru kọwaa na mpụta ọpụtara bụ mkpali mmụọ onwere iji kwalitekwuo otu ndọrọndọrọ APC na mpaghara Southern Nigeria, ma wetakwa nturu ugo na ntule aka ọchịchị, ọ kọwakwara na ha ga eji mgbasa ozi ha rụọ ọrụ na mpaghara niile enwere na South, dịka ọ gara n’iru kpọkuo ndị ndu niile enwere na otu ndọrọndọrọ ahụ nakwa ndị ọnụ n’eru n’okwu ka ha kwado mbụ ha na gba iji wube ezigbo mgbarọgwụ ga enyeaka mee ka ha turu ugo na ntule aka ọchịchị.
Nwoye kwuputara na ya na ndị otu ya ga enweta akwụkwọ nomination forms n’oge n’adịghị anya iji malite ọrụ ha n’ozuzu oke ya, ọ gara n’iru mee ka amata maka oke n’ọrụ otinyegoro n’otu ndọrọndọrọ ahụ nakwa ọkwa dị iche iche ojigoro na yabụ otu ndọrọndọrọ ndị gụnyere: onye odeakwụkwọ Forum nke APC State Chairman, onye ịsị oche Caretaker Committee na Enugu State, bụ ebe onyere aka hazịe otu ndọrọndọrọ ahụ ma nyekwa aka ghazịkwa ntule ọchịchị ime ụlọ nke otu ndọrọndọrọ ahụ.
Dịka ọ kọwara na otu ndọrọndọrọ APC na atụ anya ichikọba ọgbakọ convention n’ọdị n’iru n’ime afọ a anyị nọ n’ime ya iji ghọpụta otu National Working Committee ọhụrụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.