Latest Updates
Page: 15
Onye isi ala mba America bu President Donald Trump emela ka amata na ya nwere olile anya inwe nkparita ubobo nyere ogbo ya nke mba Russia bu president Vladimir Putin n’ ime mkpuru ubochi ole mo olen’ abia n’ iru, dika ndi olu nchekwa mba US n’ adi njikere ime njem gawa mpaghara Moscow n’ […]
Ndị oji egbe ana amaghị egbuola otu nwoke gbara afọ iri asatọ na anọ bụ onye ndu obodo Umudioka nke council ime obodo Awka South na Anambra Steeti bụ Ichie Michael Nwobu. Ndị nta akụkọ nwetara ozi na Ichie Nwobu ka e gburu n’ime ụlọ ndina ya n’ụtụtụ ụbọchị ụka n’oge ndị ezinụlọ ya gachagoro […]
Otu nwa afọ obodo Ụmụikpa nke dina Akanu Item nke council ime obodo Bende na Abịa State bụ Mr Isaac Maduka akwala arịrị ka a gbatara ya ọsọ enyemaka n’ebe o metụtara ịnye nwa ya egburu n’ike ikpe nkwụmoto bụ Ndukwe Isaac gbara afọ iri abụọ ma bụrụ onye egburu site n’aka ndị ntorobịa obodo […]
Gọọmenti Anambra Steeti ekwuola sina mmachi ahụ ha machiri izi ozi ọma n’okporo ụzọ yana ahịa abụghị ka ha kwụsị ozi ọma Alaeze eluigwe kama na ọ bụ iji gbochie mkpọtụ na esi na ya apụta. Commissioner n’ahụ maka nzirikota ozi na Anambra Steeti bụ Dr Law Mefor kwuru nkea n’ozi o nyefere ndị nta […]
Otu jikọtara ụmụ Igbo n’ụwa niile akpọrọ ọhaneze Ndigbo emela ka o doo anya na ha ga-eme ihe niile ike kwere ha ịhụ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla wepụtara nwa afọ Igbo dịka onye ga a zọro ha ọkwa onyeisi ala ma wepụta onye mgbago ugwu dịka osote ya maka ntụliaka onyeisi ala Nigeria nke […]
Aka ndị uwe ojii na Bauchi State akparala otu nwoke gbara afọ iri abụọ bụ Safiyanu Dalhatu maka ebubo iji aka ya were tigbuo nne ya n’oge ha na-enwe esemokwu. Nkea pụtara ìhè n’akwụkwọ ozi ọnụ na e kwuru ụlọrụ ahụ nọkwa nke police Public Relations Officer bụ Ahmed Wakili wepụtara n’ụbọchị Tuesday. Ya bụ […]
Ụlọrụ n’ahụ maka ntụliaka ọchịchị na Rivers State bụ Rivers State Independent Electoral Commission ewepụtala abalị itoolu nke ọnwa August n’afọ a dịka ụbọchị ọhụrụ aga eji meghari ntụliaka council ime obodo na state ahụ. Onyeisi oche nke ya bụ ụlọrụ bụ Justice Adolphus Enebeli jegoro ezumike nka kwupụtara nkea mgbe yana ndị ọnụ na […]
Ndị uwe ojii na Ebonyi State anwụchiela otu nwoke bụ Ovuta Chigozie maka iji okpokoro isi mmadụ abụọ yana egbe atọ a rụrụ n’ala anyị were na akpaghari.Nwoke ahụ ana enyo enyo ka e kwuru na o sitere n’ime obodo Okoffia nke dina council ime obodo Ezza South na Ebonyi State. Na mgbe ana agba […]