Eduola Soludo Nakwa Osote Ya Na Iyi Olu Ochichi Nke Ugboro Abuo
Written by admin on March 17, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Eduola aka na achi Anambra State bu Gov Charles Chukwuma Soludo nakwa osote ya bu Dr Onyekachukwu Ibezim na iyi olu na ochichi nke ugboro abuo ha na State ahu.
Nke a putara ihe taata bu Tuesday na ogige Alex Ekwueme Square dina Awka bu isi obodo yabu Anambra State na mmeme idu na iyi olu a dotara otutu ndi eji okwu ha agba izu na State ahu nakwa na Nigeria na izugbe ya
Ufodu na ime ndi ahu sonyeziri na mmeme idu na iyi olu a gunyere; osote onye isi ala anyi bu Vice President Kashim Shettima, onye ahu jiburu okwa onye isi ala bu Chief Olusegun Obasanjo, ogbo ya bu Dr Goodluck Jonathan, onye jiburu okwa Secretary General otu Commonwealth of Nations bu Chief Emeka Anyaoku, aka na achi Rivers State bu Gov Siminalayi Fubara nakwa otutu ndi ozo.
Na okwu ya ka Gov Soludo toro ndi Anambra State maka nkwado ha ma tokwa President Bola Ahmed Tinubu nakwa ndi ozo dika okwere nkwa iga na iru na ezi ochichi nyere ohaneze umu afo nakwa ndi bi ebi na Anambra State.
Na nke ya ka Vice President Kashim Shettima kwuputara afo ojuju ya nyere ochichi Gov Soludo.
Iga echetazi na obu na ntule aka ochichi Governorship election were onodu na abali asato nke onwa November afo 2025 gara aga ka Gov Soludo nakwa Dr Ibezim nwetara nturu ugo na ochichi nke ugboro abuo eduru ha na iyi olu a taata bu Tuesday, abali iri na asaa nke onwa March afo 2026.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.