GBARA OGWU GI NUO MA ZEERE ANYI – KA MBA ETHIOPIA NA ADO EGYPT AKA NA NTI

Written by on September 9, 2024

Mba Ethiopia adola aka na nti dogara mba Egypt ka ozeere mpaghara odommiri ya putara osimmiri River Nile bukwanu ebe mba ahu siri adota ume oku electric oji aru olu.

Nke a n’ abia dika ujo dina etiti yabu mba Ethiopia nakwa Egypt n’ akawanyezi njo dika osiri di taata bu Monday.

Isi obodo mba Ethiopia bu Addis Ababa doro mba Egypt aka na nti a taata dika nzaghachi megide akwukwo ozi mba Egypt noro n’ izu uka gara aga degara ogbako nchekwa mba uwa bu United Nations Security Council megide yabu mba Ethiopia.

Egypt boro Ethiopia ebubo site na yabu akwukwo ozi odegara UN Security Council sina mba ahu n’ ada iwu mba uwa megide onodu ya na odommiri Hydroelectric Dam putara na yabu osimmiri River Nile.

Ethiopia kowaziri na obu ebubo ugha juputara n’ akwukwo ozi ahu mba Egypt degara ogbako nchekwa mba uwa.

Nke a n’ abiakwu dika mba Egypt n’ aga n’ iru na nkwalite udo mmekorita ndi agha ya nyere mba Somalia gbara mba Ethiopia agbata obi ma buru mba n’ enweghi ezi onodu mmekorita nyere yabu Ethiopia.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies