Gbenga Hashim Agbaghapula Otu Ndorondoro Ochichi PDP

Written by on April 7, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Nwa amadi welitere isi nke oma na otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP na ala anyi ma burukwa onye kwuputaburu mmasi ya iji okoloto yabu otu ndorondoro zoo okwa onye isi ala na ntule aka ochichi afo 2027 bu Dr Gbenga Hashim agbala alukwaghim na yabu otu ndorondoro PDP.

Dr Hashim mere ka opupu ya na otu ndorondoro PDP puta ihe na ozuzu oke ya taata bu Tuesday bukwanu ebe onoro kowa nghotahe ime ulo na ada na otu ndorondoro ahụ dika nke kpatara mkpebi ya.

Nwa amadi a kwuputara na yabu nghotahe na akawanye njo kwa ubochi ebe mbo niile agbagoro idozi ya machara afo na ala.

Na akwukwo alukwaghim ya na otu ndorondoro PDP odegara onye isi oche otu ndorondoro a na onumara Usuma Ward nke Bwari Area Council dina FCT Abuja ka Dr Hashim kowara enweghi afo ojuju megide nkewasi nghotahe butegoro PDP kemgbe ihe ruru otu afo.

Okenere yabu onye isi oche otu ndorondoro na onumara ahu nakwa ndi so ya achi gunyere ndi eji okwu ha agba izu maka nkwado nakwa nrukorita olu hana enye ya kemgbe.

Ozi meziri ka amata na yabu Dr Gbenga Hashim sona ndi choputara otu ndorondoro PDP na afo 1998 ma burukwa onye izizi aroputara na okwa Deputy National Publicity Secretary otu ndorondoro a oge ahu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited