Government Kaduna State agọnarila ebubo nrụrụ aka na nhazighari nke ama egwuriegwu Ahmadu Bello Stadium.
Written by Onyinye on August 11, 2025
Government Kaduna State agọnarila ebubo nrụrụaka, nkwekọrịta nakwa mmejọ nchịkwa na nhazigharị nke ama egwuriegwu Ahmadu Bello Stadium.
Commissioner n’ahụ maka Sports Development bụ Professor Benjamin Kumai Gugong, mere ka nkea puta ihe ụnya bu Sunday, ebe ọ kọwara ebubo ahụ dika okwu asi nakwa nke na edughie ọhaneze ụzọ.
Ọ gara n’iru kọwaa na government etiti nyefere ama egwuriegwu ahụ n’aka government state ahụ na mbido afọ a na enweghi ezi ọnọdụ, bu nke mere ụlọ ọrụ ministry ahụ iji chọọ enyemaka site n’aka Governor Uba Sani iji mee ka ọnọrụ n’ogogo ka ma nyere ọnọdụ FIFA, CAF nakwa NFF.
O mekwara ka amata na usoro ahụ bu nke akwadoro n’ọnwa May afọ a bu 2025, bụkwanụ nke ụlọ ọrụ ahụ malitere ma na ejikwa ya n’usoro iwu Kaduna State Public Procurement Authority, KADPPA.
Gugong kagburu ọkwụ ahụ bu nke na ekwu na ụlọ ọrụ ministry ahụ mere nrụrụ aka n’inye ọrụ ahụ, dika ha kwụsịrị ike na ha gbasoro usoro doro anya nakwa nke iwu kwadoro.
Ọ kọwara na ọrụ ngo ahụ bu nke ga edowa Kaduna State dika ebe egwuriegwu ka mma, ma bụrụkwa ebe aga achikwa mmemme mba ụwa, weputa ọrụ ma kwalite akụ n’ụba State ahụ.