Inspector General Ndi Uwe Ojii Enyela Iwu Nnyocha Megide Ebubo Agwa Ojo Ufodu Ndi Uwe Ojii Na Ondo State

Written by on July 26, 2026

by Chidimma Kama

Onye ịsị ndị uweojii ala anyi na izugbe n’ọkwa Inspector General of Police bụ IGP Olatunji Disu, enyela Commissioner ndị uweojii na Ondo State iwu ka o mee nyocha tọrọ atọ banyere ebubo ajọ akparamagwa ndị uweojii ahutara na onyo onyo n’efegharị n’ọwa ozi mmekorita ọhaneze bụ nke gosịrị ebe ndị uweojii nọ ọrụ nkwusi na nnyocha akporo stop-and-search operation na n’okporo ụzọ Lagos-Benin Expressway n’akpa agwa n’ụzọ na ekwesịghị ekwesị.

Nkea pụtara ihe ụnya bụ Saturday site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze ndị uweojii n’izugbe bụ CSP Aniete Iniedu.

Ebe ndị uweoji okwu ahụ metụtara gụnyere: otu onye Assistant Superintendent of Police nakwa ndị Inspectors mmadụ atọ, bụkwanụ ndị achọtagoro ndị ha bụ ma nọrọ n’aka ndị uweoji ganya mgbe aga amalitela ikpe orderly room trial.

Dịka IGP Disu kọwara na akparamagwa ndị uweojii ahụ egosịghị ezi ọrụ nke Nigeria Police Force, o mekwara ka amata na ha agaghị anabata mmegide ọbụla gara ụmụ afọ ala anyị ebe onye ọbụla ahụtara n’akpa agwa ekwesịghị ekwesị ga enweta ntaramahụhụ ya.

N’ikpeazụ ka habụ ndị uweojii Nigeria Police Force kweghachịrị nkwa ezi ọrụ ya nakwa ịgba mbọ hụ na ntụkwasị obi ndị obodo nwere n’ọrụ ha abụghị nke aga eleda anya.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited