Ndi Uwe Ojii Amalitela Nnyocha Gaara Onwu Ikwu Udo Na Ike Onye Ukochukwu Na Akwa Ibom State
Written by admin on July 26, 2026
by Chidimma Kama
Ndị uweojii ala anyị na Akwa Ibom State emela ka amata na ha amalite nnyocha banyere ihe kpatara ebubo otu onye ụkọchukwu enyere aha ya dịka Etetim Udo jị were aka ya gbuo onwe ya na Oron LGA na State ahụ.
Yabụ nwa amadi nwụrụ anwụ bụ onye chọpụtara ma bụrụkwa General Overseer nke ụlọ ụka Power in the Word of God for the World Ministries, bụkwanụ onye akọwara na o jị ụdọ kwụgbuo onwe ya.
Nkea pụtara ihe ụnya bụ Saturday site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uweojii ala anyị na State ahụ bụ DSP Timfon John na Uyo bụ ịsị obodo State ahụ, dịka ọ kọwara na ha kwetara ozi banyere ọnọdụ ahụ n’ụbọchị Thursday abalị ịrị abụọ na atọ nke ọnwa July afọ a bụ 2026, n’ihe dịka ojiri nkeji ịrị na asatọ gafere elekere asatọ nke ụtụtụ site n’aka otu onye bị na mpaghara ahụ.
Yabụ onye Police Public Relations Officer PPRO gara n’iru mee ka amata na ha bugara nwa amadi ahụ n’ụlọ ọgwụ bụ ebe onye dọkịta kwupụtara ọnwụ ya, ebe ha bugazịrị ozu ya n’ọba nchekwa ozu ganye mgbe aga eme ya nyocha autopsy.
DSP John mekwara ka amata na Commissioner ndị uweojii na State ahụ bụ CP Baba Mohammed Azare, n’oge ọ na ekwe ọhaneze nkwa na aga eme nyocha tọrọ atọ iji mata ihe kpatara ọnwụ nwa amadi ahụ, ọ rịọriọ onye ọbụla nwere ozi ga abara ha uru gbasara okwu ahụ ka onye dị etu ahụ kpọtụrụ ha ma ghara ịna ekesa ozi awarawa.
