Ndi Otu Ndorondoro NDC Ekwuputala Nkwado Ha Gaara DR Johnpaul Anih Na Ndi Otu Ya Na Enugu State

Written by on July 25, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

 

 

Ndi otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC na Enugu State ejirila otu olu na otu obi kwuputa ntukwasa obi ha gaara otu nchikwa State Working Committee yabu otu ndorondoro na State a nke Dr Johnpaul Anih nona isi ha, ma doo aka na nti megide ndi ana ebo ebubo atumatu ojo itisa otu ndorondoro a ka ha sepu aka enwe na ofe tupu oghoro ha aka mmadụ.

Nke a putara ihe taata bu Saturday na nzuko jikoro ndi nchikwa, ndi onu na eru na okwu, ndi na azo okwa ochichi nakwa ndi otu yabu otu ndorondoro NDC na State a bukwanu ebe ha noro too habu ndi NDC State Working Committee maka ezi olu ha ibugo otu ndorondoro a na ogogo puru iche.

Na okwu ogwara ndi nta akuko na ngwucha nzuko a ka onye isi oche NDC na Isi-Uzo LGA bu Hon Jonathan Ogbu mere ka amata na obu naani Dr Johnpaul Anih nakwa ndi otu ya bu ndi iwu kwadoro dika ndi nchikwa otu ndorondoro a na Enugu State ma buru ndi sitere na ogbako Congress kwu siriri werere nke ulo olu Independent National Electoral Commission INEC gara leta rigoro na ochichi, dika okowara na akaghi ina anu ihe banyere NDC na State a ma oburu na habu ndi nchikwa no ugbu a anaghi azo ukwu dimkpa na ezi olu.

Na otu aka ahu ka onye isi oche otu ndorondoro a na Igbo-Eze North LGA bu Hon Kingsley Ape nakwa ogbo ya nke Aninri LGA bu Hon Stephen Ajah mere ka amata na Dr Anih nakwa ndi otu ya dika ndi nchikwa otu ndorondoro a na ogogo State etinyego NDC na ezi onodu isonyere nke oma na ntule aka ochichi Local Govt Elections na akpudobe nso na State a.

Habu ndi ndu nakwa ndi onu na eru na okwu na otu ndorondoro NDC doro aka na nti gaara ndi ji atumatu ojo ikeputa alaka ozo na udi akporo parallel party structure ma obukwanu megide ndi otu ndorondoro a na State a, dika ha kwuputara mmetuta ha megide onodu ndi nchikwa yabu otu ndorondoro na ogogo etiti ala anyi.

Na oge hana ekwunwo nkwado ha gaara ndi nchikwa a nke Dr Johnpaul Anih nona isi ha ka habu ndi otu ndorondoro NDC na Enugu State yoro ndi nchikwa ogogo etiti otu ndorondoro a ka ha zeere ihe obuna ga amunyekwu oku amaghi kwuru na yabu otu ndorondoro.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited