Israel Anuola Iyi Iga Na Iru Na Agha Megide Iran Nakwa Lebanon
Written by admin on March 13, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi agha mba Israel ekwuputala nkawanye njo agam na iru agha hana ebu emegide mba Iran bu mba mejuputara na ndi okpukpere uka Islam na mpaghara Middle East.
Nke a bu dika ndi agha Israeli Defence Forces IDF buru nnukwute agha mgbariko gaa na iru na ibi aka ojo na Tehran bu isi obodo yabu mba Iran.
Ndi agha military mba Israel nokwara na aka nke ozo nye iwu nkwapu na ike dika osiri metuta nkusu ohuru hana emegasi aghara aghara na Beirut bu isi obodo mba Lebanon.
Na okwu ya ka onye ndu ejecha ogwu ohuru mba Iran na okwa Iranian Supreme Leader bu Mojtaba Khamenei noro unya bu Thursday nye nkwuwa okwu izizi ya ma kpo oku ka ogige niile ndi agha mba United States of America nona na mpaghara Middle East mee ngwangwa mechisie ma obukwanu chere agam na iru nkusu.
Nke a na abia dika mba Saudi Arabia mere ka amata na ndi agha elu ya agbatugo ngwa ogu Drones ozo di asato na mpaghara etiti nakwa owuwa anyanwu mba ahu gunyere Riyadh bu isi obodo yabu Saudi Arabia.
Habu ngwa ogu Drones mba Saudi Arabia gbaturu ka ana ebo ebubo na obu mba Iran ji ha buru agha banye mba ahu ichoghari ogige ndi agha mba America ma elegara anya na obu America jikoro aka yana mba Israel ebu agha mkpochapu emegide ndi isi ochichi nakwa ndi agha Iran.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.