Mba Pakistan Nakwa Afghanistan Anuola Iyi Iga Na Iru Na Agha Nkwafusi Obara
Written by admin on February 27, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Mba Pakistan emela ka amata na omepego onu uzo agha megide ochichi ndi isi ekwe onwu Taliban nona isi ugbo mba Afghanistan.
Nke a putara ihe taata bu Friday site na onu Minister na ahu maka ndi agha mba Pakistan bu Khawaja Asif na okwu ogwara ndi nta akuko na Islamabad bu isi obodo mba ahu.
Anokwara na aka nke ozo huta nnukwu nkusu sitere na ugboagha fighter jets na isi obodo nke mba Afghanistan bu Kabul dika agha na ari elu oji na okere ala etiti habu mba abuo.
Na nke ya ka onowu na okwa Prime Minister mba Pakistan bu Shehbaz Sharif mere ka amata na mba ya no kemgbe acho udo mana ndi agha mba ahu ga anorozi ugbu a kwudosie ike na ibu agha megide ndi na achu ha.
Na otu aka ahukwa ka onu na ekwuru otu isi ekwe onwu Taliban nona isi ugbo ochichi mba Afghanistan bu Zabihullah Mujahid mere ka amata na ndi agha mba ya no ugbu a ebu nnukwute agha emegide ndi agha mba Pakistan na mpaghara Durand bu ebe kewara habu mba abuo.
Nkawanye njo agha a na ada na etiti habu mba Pakistan nakwa Afghanistan ka emere ka amata na ositere na ogu ndi agha ha noro kemgbe izu uka ndi gagoro aga alu na okere ala habu mba abuo ma burukwa nke tagoro isi otutu ndi mmadu ma bibie ubara akuluba.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.