Minister n’ahụ maka ozi nakwa mmụgha agwa, etola aka na achi Ebonyi State kwere maka mmepe owetagoro na State ahụ.
Written by Onyinye on August 18, 2025
Minister n’ahụ maka ozi nakwa mmụgha agwa bu Alhaji Mohammed Idris, etola aka na achi Ebonyi State bu Governor Francis Ogbonna Nwifuru, kwere maka mmepe owetagoro na State ahụ n’ime afọ abụọ ọnọgoro na ọchịchị.
Alhaji Mohammed Idris mere ka nkea puta ihe n’oge ọ na ekwu okwu na ọgbakọ Town Hall meeting ya na ndi ọnụ n’eru n’okwu na State ahụ, dika otoro ọrụ flyover nakwa nke tunnel na aga n’iru na Vanco Junction, ebe ọ gakwara n’iru too nguzobe nke University of ICT, ụlọ obibi nakwa ọtụtụ ọrụ ngo okporo ụzọ, ọ kọwara ya dika ezi atụmatụ nke ọchịchị State ahụ.
Idris kọwakwara na onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu, na agbanyeghị na ọ nọrọ na ala anyi k’ọdị ugbua mana anya ya na eru na mmepe na aga na ala anyi a, dika ọ ga enwe afọ ojuju banyere ezi ọrụ nakwa mmepe dị na Ebonyi State.
N’okwu ya, ka Governor Francis Ogbonna Nwifuru kwuputara nkwado ya gara President Tinubu, dika ọ kwere nkwa na ụmụ afọ Ebonyi State ga akwado nlaghachite nke ugboro abuo ya n’afọ 2027.
Ọ gara n’iru kwuputakwa nkwado nakwa nkwenye onye isi ala anyi nwere na ọchịchị ya, ma kwekwa nkwa n’ịga n’iru na ewetara ụmụ afọ Ebonyi State ezi ọchịchị.
Governor Nwifuru kwuputakwara ọtụtụ ihe emeputagoro n’ebe ogbasara nrụpụta akụrụ ngwa, ezi ọnọdụ ahụike, ezi ọnọdụ agụmakwụkwọ nakwa mmepe nke mmadụ, ma too ezi udu nakwa njikọ aka dị n’etiti ndị ọnụ n’eru n’okwu na State ahụ nakwa nkwado sitere n’aka ụmụ afọ Ebonyi State.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.