Ndi Ezenwaanyi Ala Igbo Emegalara Nnamdi Kanu Njem Mkpoturu Na Ulo Mkporo
Written by admin on March 12, 2026
by Chika Nwazu
Otu jikọtara ndị eze nwaanyị n’ala Igbo akpọrọ Titled Spiritual Mothers of Igboland emela njem ha ga zute onye ndu otu Indigenous people of Biafra IPOB bu Mazi Nnamdi Kanu n’ụlọ mkpọrọ dina Sokoto State.
Ha mere ya bụ njem na ubochi Wednesday site n’aka onye du ha bụ Odoziaku Chika Ibeneme bụ onye e chiri echiche nke Nne Mmanwu Igbo Niine.
Odoziaku Ibeneme bụ ya jibu ọkwa Commissioner hụrụ maka ọrụ na Anambra State ma bụrụ onye àmà ama maka ịchekwaba omenala Igbo.
Ndị ọzọ yana ya so bụ Lolo Eze Nwanyị Nnewi.
Ozi mere ka amata na ha nọrọ n’oge ahụ kpere Mazi Nnamdi Kanu ekpere bụ onye ha kọwara nwa ha hụrụ n’anya nke ukwuu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.