Ndị nchịkwa NYSC, agọnarila ozi ahụ n’efeghari n’uwa ozi.
Written by Onyinye on August 11, 2025
Ndị nchịkwa n’ahụ maka ndị ji otu afọ efe ala anyi a bu Nigeria, yabu management of the National Youth Service Corps NYSC, agọnarila ozi ahụ n’efeghari n’uwa ozi bu nke boro ebubo na otu onye ji otu afọ fee ala anyi a, enyere aha ya dika Ushie Rita Uguamaya nke akara ya bu LA/24B/8325, bu onye ajụrụ inye asambodo gosiri na oji otu afọ fee ala anyi a, yabụ Certificate of National Service kwere maka ebubo banyere ihe odere gbasara ọchịchị dị ugbua.
Nkea putara ihe site n’ozi ha wepụtara n’ụwa ozi ha, ebe ha kọwara ozi ahụ n’efeghari n’uwa ozi dika okwu asi nakwa nke na edughie ụzọ, dika ha kọwara na mkpebi ijichi asambodo ahụ bu iji dọọ ya aka na ntị, na ọ bụghị nke okwe ndọrọndọrọ.
N’okwu ha, ụlọ ọrụ NYSC mere ka amata na nwada Ushie so n’ime mmadụ otu narị na iri atọ na otu ejichiri asambodo ha kwere maka ọtụtụ mmebi iwu, mana nwada Ushie bu onye atụkwasịrị ọnwa abụọ kwere maka na ọbịaghi nyocha biometric clearance exercise n’ọnwa April afọ a bu 2025, bu usoro iwu n’achikwa ụlọ ọrụ ahụ.
Ụlọ ọrụ NYSC riọkwara ọhaneze ka ha mee nyocha ha nke ọma ma ghara ina akwanye ya na okwe ndọrọndọrọ, dika ha kọwara na igbati oge bu ihe ana emebu na mbu n’ụlọ ọrụ.
Ụlọ ọrụ NYSC kwuputara njikere ha dị, n’igbasoro iwu na achịkwa ụlọ ọrụ ahụ, ma kwekwa nkwa iguzosike na usoro ndị ahụ eji mara ụlọ ọrụ ahụ ma jidekwa njirimara ha bu Nigeria bu nke anyị, Nigeria k’anyi ga efe.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.