Ndị obodo Ọgwashi-Uku community nke Aniọcha South LGA na Delta State nọ n’egwu kwere maka ụmụaka anọ atọrọ na obodo ahụ.
Written by Onyinye on April 22, 2025
Ndị obodo Ogwashi-Uku community nke dị na Aniocha South LGA na Delta State nọ n’ụjọ kwere maka ebubo na ndi ana enyo enyo na ha bu ndi na agba mgbere ụmụaka tọrọ ụmụaka anọ na obodo ahụ.
Mmadụ abụọ n’ime ndị ahụ atọrọ bu ndi ofu Nne ji bukwanu ndi enyere aha ha dika Ebube nakwa Miracle, ozi kọwara na ihe ahụ mere na Ụmụokwe quarters ebe ụmụ nwanyị atọ anamaghi ndị ha bu bịara kwụọ ụgwọ ụlọ na quarters ahụ.
Ozi gara n’iru kọwara na ụmụ nwanyị ahụ ji aghọ na ha chọrọ igonye ụmụaka ahụ ihe were kpọrọ ha puọ, mana dika elere anya ha na gburugburu ahụ, ndị bigasi na gburugburu ahụ gara n’ụlọ ụmụ nwanyị ahụ mana onweghi onye ha hụrụ ebe ahụ.
Onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii na State ahụ bu SP Bright Edafe mere ka nkea puta ihe, dika omere ka amata na ha nwuchiri landlady nwe ụlọ ahụ ụmụ nwanyị ahụ ana enyo enyo nọ tupu ha atọrọ ụmụaka ahụ.
Ọ gara n’iru kọwaa na atọrọ ụmụaka ahụ dika mkpụrụ ụbọchị atọ gachara ụmụ nwanyị ahụ bịara kwụọ ụgwọ ụlọ n’ebe ahụ.
Ọ rịọrọ ndị obodo ahụ ka muru anya ka azụ dika ndị nchekwa n’aga n’iru na nyocha ha iji chọta ụmụaka ahụ ma nwuchie ndị ahụ aka ha dị n’ọba ekere ede.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.