Ndị otu ndọrọndọrọ Labour Party akatọla oke ogbugbu ana egbu na Benue State.

Written by on June 18, 2025

Ndị otu ndọrọndọrọ Labour Party LP akatọla oke ogbugbu ana egbu na Benue State ma kpọ ọkụ ka eme ngwa ngwa ziga ndị ọrụ nchekwa na mpaghara obodo dị iche iche ọdachi ahụ kacha emetụta na State ahụ.

Ha kọwara ogbugbu ahụ na aga n’iru na State ahụ dika nke na enweghi isi, onye National Caretaker Committee nke otu ndọrọndọrọ ahụ nke onye nọ n’isi ya bu Senator Nenadi Usman, kwuru ka eme nyocha pụrụ iche iji nwuchikọ ndị ahụ na akpa ike ọjọ a na State ahụ na agbanyeghị ndị ha bu.

N’ozi putara ihe ụnya bu Monday, onye nọ dị ka onye isi oche otu ndọrọndọrọ ahụ, kwupụtara obi nwete ya gbasara ogbugbu ihe karịrị mmadụ otu narị, ụmụ nwanyị, ụmụaka, ndị ana achọ achọ nakwa ndị ọrụ nchekwa tinyekwara ọtụtụ ụlọ ebe obibi nakwa ihe ndị mmadụ nwere emebiri emebi.

Ọ gara n’iru kọwaa na oke ọbara ana akwafusi na Benue State bu nke kwesịrị ịmetụta obi onye ọbula na ala anyi a, dika o mere ka amata na nke ahụ bu ihe gụsịrị na enweghi ezi ọchịchị na ala anyi.

Na ngbakwụnye enyemaka ndị agha ala anyi, otu ndọrọndọrọ LP kpọrọ oku ka enyere ndị ọdachi ahụ metụtara aka site na ịnye ha nri, ebe obibi, ikpọ ga ha n’ụlọ ọgwụ tinyekwara ọtụtụ enyemaka ndị ọzọ.

Otu ndọrọndọrọ Labour Party kwere nkwa ịga n’iru n’ikwuputa ihe ga eweta udo ma nyere ụmụ afọ Nigeria aka ọkachasi ndị bi n’imime obodo nakwa obodo ndị ahụ na enwe ihe ọdachi.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited