Ndị ụlọ ọrụ Nigerian Railway Corporation NRC, emela ka amata na government etiti amalitela nrụgharị nakwa nhazigharị nke okporo ụzọ ụgbọ oloko.

Written by on July 11, 2025

Ndị ụlọ ọrụ Nigerian Railway Corporation NRC, emela ka amata na government etiti amalitela nrụgharị nakwa nhazigharị nke okporo ụzọ ụgbọ oloko nke ọwụwa anyanwụ ala anyi a.

Nwa amadi ahụ bu onye njikwa okporo ụzọ ụgbọ oloko, na Eastern District na Enugu bu Mazi Victor Adamu mere ka nkea puta ihe n’oge ọ na aza ndị nta akụkọ ajụjụ maka nyocha gbasara ịgbahapụ okporo ụzọ ụgbọ oloko na ala anyi a.

Adamu kwuru na nrụgharị nakwa nhazigharị nke okporo ụzọ ụgbọ oloko amalitela site na Port Harcourt gawa Aba, na Abia State.

N’okwu ya, ọ kọwara na igwe ahụ dị warara gafere mpaghara ọwụwa anyanwụ, site na Port Harcourt ruo Maiduguri nakwa mpaghara ndị ọzọ na ala anyi a bu Nigeria, dika okwenyere na akwụsịri ọrụ site na Aba dị na Umuahia gbadata na Enugu State.

Kosila dị, Adamu mere ka amata na government etiti na agba mbọ iji hụ na amalitere nrụgharị nakwa nhazigharị nke okporo ụzọ ụgbọ oloko ndị fọdụrụ n’oge na adịghị anya.

Ọ gara n’iru mee ka amata na site na atụmatụ Renewed Hope Agenda nke onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu ji n’aka, na ọrụ amalitela na okporo ụzọ ụgbọ oloko, ọ kọwakwara na ọchịchị President Tinubu weputara amuma nke nyere government state ohere itinye ego na okporo ụzọ ụgbọ oloko.

O mekwara ka amata na ọchịchị Anambra, Abia nakwa Enugu States dị njikere isonye na amụma ahụ.

Kosila dị, ọ kọwara omume ọjọ nke ndi na emebi iwu dika ihe kachasị echere ụlọ ọrụ NRC aka mgba, ọkachasi n’ebe ometutara akurungwa ha ji arụ ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ.

Adamu kọwakwara, na iji chekwa akụrụngwa ụgbọ oloko, na ndi ụlọ ọrụ NRC jikọrọ aka ọnụ ha na ndi uweojii ala anyị, ndị nchekwa Nigeria Security and Civil Defence Corps NSCDC, ndị agha ala anyi nakwa ndị vigilante groups.

Okwuru na site na njikọ aka ahụ ndị ụlọ ọrụ NRC, ndị uweojii, ndị agha ala anyi nakwa ndị NSCDC nwere, na anwụchiela ụfọdụ ndị na emebi iwu ana enyo enyo, ebe akpụpụrụ ụfọdụ n’ime ha n’ụlọ ikpe.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited