Ndị uwe ojii ala anyị ngalaba ha nke Federal Capital Territory agoola ụkwụ n’aka ha na ebubo ahụ nọrọ na ọwa ozi social media kwuo na ejichiri otu onye ọrụ ha.

Written by on April 22, 2025

Ndị uwe ojii ala anyị ngalaba ha nke Federal Capital Territory agoola ụkwụ n’aka ha na ebubo ahụ nọrọ na ọwa ozi social media kwuo na ejichiri otu onye ọrụ ha nọkwa inspector ebe o bu egbe AK 47 yana mgbọ iri atọ ebugara ndị amakekwu na Nassarawa state.

N’otu akwụkwọ ozi bịara ụnyaahụ bụ Monday ka onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uwe ojii na Abuja bụ SP Josephine Adeh kọwara na otu ihe mere n’abalị iri na itoolu nke ọnwa April n’afọ na mpaghara ọdụ ụgbọala dina Keffi nke Nyanya bụ nke e mechara tụgharịa na ọwa ozi.

Dịka SP Adeh sịrị kọwaa, na ọ bụ onye ọrụ ha bụ inspector Kasim Usman bu ya bụ egbe nke nwere nsogbu ma kechie ya na ngwugwu si Abuja n’aga Nassarawa state bụ ebe ọ ga anọrọ dozie ya.

Ndị uwe ojii na Abuja tinyere onye ji ọkwa Commissioner ha mechara gwa ọhaneze ka ha leghara akụkọ ahụ anya na ọ bụghị ihe mere ka a malitere gbasawa na ọwa ozi.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited