Ndị uweojii ala anyị na Akwa Ibom State ejichiela mmadụ anọ ana enyo enyo na ha bu ndi na agba mgbere ọgwụ ike na State ahụ.
Written by Onyinye on August 25, 2025
Ndị uweojii ala anyị na Akwa Ibom State ejichiela mmadụ anọ ana enyo enyo na ha na agba mgbere ọgwụ ike maka ịkpụpụ ha n’ụlọ ikpe na Uyo bu isi obodo State ahụ.
Nkea putara ihe nye ndị nta akụkọ, site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uweojii na State ahụ bu DSP Timfon John ụnya bu Sunday.
DSP John, kọwara na site n’ezi amamihe ndị uweojii n’ozi ha nwetara, ha wakporo ọtụtụ ebe ana enyo enyo na ndị na agba mgbere ọgwụ ike ji mere isi ọnọdụ na Uyo, n’ihe dịka elekere ịrị nke abalị, na abalị asatọ n’ọnwa August afọ a anyi nọ n’ime ya.
DSP John, kọwara na ha nwetara ọtụtụ ọgwụ ike ana enyo enyo na ọ bu Indian hemp amakariri dịka igbo, ebe ọ gara n’iru mee ka amata na nyocha ka na aga n’iru k’ọdị ugbua.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.