Ndị uweojii ala anyị ngalaba nke Police Service Commission akagbola ozi ahụ n’efeghari n’uwa ozi dika ozi na edughie ụzọ.

Written by on August 4, 2025

Ndị uweojii ala anyị ngalaba nke Police Service Commission PSC akagbola ozi ahụ n’efeghari n’uwa ozi banyere na ndi uweojii amalitela iwe ndị mmadụ n’ọrụ Nigeria Police Force nke afọ a bu 2025, ebe ha kọwara ozi ahụ dịka okwu ụgha nakwa nke na edughie ụzọ.

N’ozi pụtara ihe site n’ọnu na ekwuchitara ndị uweojii bu Ikechukwu Ani, mere ka amata na ndị uweojii ala anyị amalitebeghi iwe ndị mmadụ n’ọrụ, dika ọ riokwara ọhaneze ka ha wepu uche n’ozi dị etu ahụ.

Ọ kwụsịrị ike na n’ụlọ ọrụ PSC ga agbasoro usoro kwesịrị ekwesị mgbe ọbula ha malitere iwe ndị mmadụ n’ọrụ, dika ọ riọkwara ndị nwere mmasị na ya ka ha nwe ndịdị ma chere mgbe ha ga amalite iwe ndị mmadụ n’ọrụ.

Ani gara n’iru katọ agwa ekperime a ụfọdụ ndị mmadụ na adị na akpa iji na-apụnari ụmụ afọ Nigeria ego mgbe ọbula ha kwadoro iwe ndị mmadụ n’ọrụ.

Ọ riọkwara ndị ọrụ nchekwa n’ahụ maka ụwa ozi ka ha gba mbọ chọpụta ndị ahụ aka ha dị n’ikesa ozi adịgboroja ahụ banyere ndị uweojii iwe n’ọrụ ma nye ha ntaramahụhụ ruru ha.

Dika omere ka amata na ụlọ ọrụ PSC dị njikere igbasoro usoro kwesịrị ekwesị nakwa ụzọ iwu kwadoro mgbe ọbula ha malitere iwe ndị mmadụ n’ọrụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited