Ndị Uweojii Na Anambra State Emela Ka Amata Enyemaka Ha Jiri Napụta Otu Nwoke Dara Na Ike Na State Ahụ

Written by on April 7, 2026

by Chidimma Kama

Ndi uwe ojii ala anyi na Anambra State emela ka amata enyemaka ha jiri naputa otu nwoke dara na ike na akuku okporo uzo dina mpaghara Awada nke Onitsha na State ahu.

Nke a putara ihe site na ozi onye mmekorita ọhaneze nyere habu ndi uwe ojii na State ahu bu SP Tochukwu Ikenga nyefere ndi nta akuko na ogige Police Command’s Headquarters dina Awka.

SP Ikenga kowara na obu ndi uwe ojii sitere Awada Police Division hutara yabu nwoke ebe odara na ike oge ndi uwe ojii ahu no ngaghari olu nchekwa mmeme Easter.

Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO koro ndi nta akuko na ndi uwe ojii ahu mere ngwangwa wuchie ebe nwoke ahu tosara na akuku okporo uzo sitere Onitsha gawa Enugu ma buru ya buga ulo ogwu di nso ebe ahu maka ogwugwo.

Nwa amadi a ji okwa onu na ekwuru ndi uwe ojii ala anyi na Anambra State kowaputara na ozi mbuzo na arutu aka sina oga abu nsogbu gbatagbata aruike nke sitere na obara mgbalu elu amara dika high blood pressure nwere ike ipiatu yabu nwoke na akuko okporo uzo ebe ahu ndi uwe ojii gara naputa ya.

Na ikpeazu ka okowara na Commissioner ndi uwe ojii na State ahu bu CP Ikioye Orutugu noro na oge ona eto ndi uwe ojii ahu ruru olu enyemaka a mee ka amata na habu ndi nchekwa abughi naani maka igbochi na ibu agha megide agwa ekperima kama na hana arukwu olu enyemaka nakwa ichekwa ndu ndi mmadu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited