Nwa amadi ahụ jitọpụrụ ọkwa onye isi ala anyi a anọrọla ụnya bu Sunday zaa ọkụ chi ya kpọrọ ya.

Written by on July 14, 2025

Nwa amadi ahu jitọpuru ọkwa onye isi ala anyi bu Former President Muhammadu Buhari anorola ụnya bu Sunday rapu elu uwa a gawa iza oku chi kporo ya na bee ndi mmuo.

Nke a putara ihe na uhuruchi ụnya bu Sunday site na ozi onu na ekwuru ezinulo yabu onye jitopuru ọkwa onye isi ala bu Mallam Garuba Shehu nyefere ndi nta akuko.

Mallam Garuba Shehu kọwara na Muhammadu Buhari nwuru ụnya na ulo ogwu dina London nke obodo England ma buru isi obodo mba United Kingdom amakwuru dika mba Britain.

Late President Muhammadu Buhari ka amuru na abali iri na asaa nke onwa December afo 1942 na obodo ya dina Daura nke Katsina State nyere nne na nna ya bu ndi agburu Fulani, kpatara na obu onwa December nke afo a bu 2025 kara ime ya afo iri asato na atọ na elu uwa.

Late President Buhari buru uzo noro na agbata afo 1983 ruo 1985 jie okwa onye isi ala na ọchịchị ndi agha akporo military Head of State, ebe ọnọziri na agbata afo 2015 ruo 2023 jie okwa onye isi ala Nigeria na ọchịchị ndi nkiti dika ọbu ya nyefere President Bola Ahmed Tinubu na achi ala anyi ugbu a okwa na abali iri abụọ na iteolu nke ọnwa May afo 2023.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited