NWE NKWANYERE UGWU NYERE UKPORO IWU KA PANDEF, URHOBO NA AGWA NDI AGHA NIGERIA MAKA OBODO OKUAMA

Written by on February 7, 2025

Otu ahu jikoro mpaghara Niger Delta amara dika Pan Niger Delta Forum PANDEF nakwa otu jikoro ndi ndu agburu Urhobo akwala ariri megide onwu ufodu ndi ndu ama ama na obodo Okuama nke Ughelli South LGA dina Delta State bukwanu ndi ana akowa na obuna aka ndi agha military ala anyi jichiri ha ka ha noro nwuo.

Ozi kowara na onye President General obodo Okuama bu Pa James Oghoroko noro na abali isii nke onwa December anyi nona ime ya nwuo na aka ndi agha ala anyi jichiri ya na ogige military facility dina Port Harcourt bu obodo Rivers State.

Na otu aka ahukwa ka onye Treasurer yabu obodo bu Pa Dennis Okugbaye noro unya bu Wednesday nwuo na aka ndi agha ala anyi ahu na njichi a ejichiri ha.

Na okwu ya banyere onodu a taata bu Thursday ka onu na ekwuru otu PANDEF bu Dr Christopher Ominimini mere ka amata na ihe otu a jikoro mpaghara Niger Delta choro bu udo na mpaghara ahu

Okporo oku ezi onodu nrube isi na ukporo iwu nke ahu amara dika Rule of Law na agbanyeghi ka ihe siri di na obodo.

 


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies