Nwunye aka n’ achi Enugu State agbapela atumatu nkuzi ihe nyere ohaneze maka igbochi oria Hepatitis.

Written by on August 1, 2025

Nwunye aka n’ achi Enugu State bu odoziaku Nkechinyere Mbah agbapela atumatu ohuru iji me ka ohaneze mata ihe mgbu nke n’ oria Hepatitis.

Yabu mmeme bu nke were onodu onodu n’ ogige isi ulo olu Enugu West LG di na uwani, Enugu bukwa nke eji kwalite ngbochi, nlele nakwa ogwugwo yabu oria.

N’ okwu ya n’ oge emume a, ka nwunye aka n’ achi Enugu State bu Odoziaku Nkechinyere Mbah noro kpatugasia aka n’ ihe banyere nkpachapu nakwa nneghara anya ana ahuta na yabu oria Hepatitis.

Odoziaku Mbah nke onye nochitere anya ya bu nwa amadi ahu ji okwa onye ndumodu puru iche nyere aka n’ achi Enugu State n’ oru puru iche bu Barr. Chidimma Egeonu rutugasiri aka etu nneghara anya nyere oria si egbochi ndi mmadu iga me nnyocha n’ oge ma nweta ogwugwo, okachasi n’ ebe umu nwanyi nakwa umu n’ eto eto no.

Ogakwara n’ iru kwe nkwa iruko olu nyere ndi ndu ime obodo di iche iche ihu n’ enyere ndi nwere oria ogwugwo n’ onu ego di ala ma gbochie ihe ima aka ndi ahu ndi mmadu n’ enwe n’ agha ana ebu emegide yabu oria.

N’ozi ekene ha ka onye isi oche okpuru ochichi Enugu south bu Hon Celeb Ani , nakwa osote ya bu Hon Tony Egbo noro too nwunye aka n’ achi state a maka ezi atumatu aru Ike a oweputara ma kowa ya dika nke ga amita ezi mkpuru.

Onye nta akuko anyi n’ obi govt Enugu bu Chukwuma Philips nwetara ozi, na ufodu ndi sonyere na mmeme a gunyere: ulo olu Emzor pharmaceuticals, onye ndu umu nwanyi ndi Enugu south, Umu nwanyi ndi onu n’ eru n’ okwu na ime Obodo ahu, ndi gbagotere n’ okwa n’ okpuru ochichi ahu, otu Nigeria Union of Local Government Employees NULGE, nakwa ndi olu n’ okpuru ochichi Enugu south.

Omekwara ka amata na n’ obu nwunye aka n’ achi Enugu State chikobara atumatu nkuzi ihe a site n’ ulo olu ministry n’ ahu maka aru Ike nakwa otutu ndi ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited