Onye Isi Ala Mba America Ekwuputala Nkwusinata Na Ibu Agha Megide Ogige Akuru Ngwa Mmanu Nakwa Ume Oku Mba Iran

Written by on March 27, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Onye isi ala mba United States of America bu President Donald Trump emela ka amata na oga aga na iru na ohere oma igbu oge nyere nkusu ya megide ogige akuru ngwa mmanu nakwa ume oku mba Iran.

President Trump kowara na nke a ga ewe abali iri malite taata bu Friday abali iri abuo na asaa nke onwa March ruo abali isii nke onwa ozo bu April.

Yabu onye isi ala mba America kowakwara na ikpa ububo udo nyere mba Iran kana aga na iru nke oma.

Na nke ya ka mba Iran sitere na onu otu onye isi ochichi mba ahu gbagotere nke oma mee ka amata na Tehran bu isi obodo yabu mba anatago ozi amuma udo sitere mba America.

Yabu onye isi ochichi na achoghi ka akpo aha ya kwuputara na amuma udo a mba America ji na aka akwughi siriri werere.

Na otu aka ahukwa ka Minister mba Pakistan na ahu maka mba ofesi bu Ishaq Dar kowara na Islamabad bu isi obodo mba ahu na aru olu yana mba Turkey nakwa Egypt maka ozi ububo udo na etiti America nakwa Iran iweta agha na ada na etiti habu mba abuo na njedebe.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited