Onye isi mba South Korea, enyela ndị nchekwa ntụziaka ka ha wepusia igwe okwu eji agbasa ozi n’oke ala ha na mba North Korea.
Written by Onyinye on August 4, 2025
Onye isi mba South Korea bu President Lee Jae-myung enyela ndị nchekwa ntụziaka ka ha wepusia igwe okwu eji agbasa ozi dịgasị n’oke ala ha na mba North Korea iji belata okwu n’eko achicha n’etiti mba abụọ ahụ.
Ọnụ na ekwuchitere ndị nchekwa South Korea’s Defence Ministry bu Lee Kyung-ho, mere ka nkea puta ihe nye ndị nta akụkọ, dika ọ kọwara na ndi nchekwa amalitela iwepu igwe okwu ahụ eji agbasa ozi taata bu Monday.
Dika oweghachara ọkwa ọchịchị n’ọnwa June, President Lee gbanyụrụ igwe okwu mgbasa ozi na-akatọ ọchịchị mba North Korea, dika ọ na-achọ ịmalite mkparịta ụka ya na ndị agbata obi ya bu mba North Korea.
Mana mba North Korea nọrọ na ọdị nso a mee ka amata na ha enweghị masi iso mba South Korea nwe mkparitauka ọbula.
Mba abụọ a ka nọ na agha nka n’ụzụ kamgbe afọ 1950 ruo afọ 1953 agha Korea kwụsịrị na ogwe aka, ọ bụghị nkwekọrịta udo, ha enwebeghi ezi mmekọrịta n’ime afọ ole na ole gara aga.
President Lee kọwara na iwepu igwe okwu ahụ eji agbasa ozi bu iji weghachite ntukwasi obi.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.