Onye isi mba United States, emela ka amata na onye ozi ya pụrụ iche ga eme njem nkpọtụrụ ga mba Russia n’izu ụka a anyi nọ n’ime ya.

Written by on August 4, 2025

Onye isi mba United States bu President Donald Trump emela ka amata na onye ozi ya pụrụ iche bu Steve Witkooff ga eme njem nkpọtụrụ ga mba Russia n’izu ụka a anyi nọ n’ime ya iji ga n’iru na mkparitauka banyere agha dị n’etiti mba Russia nakwa mba Ukraine.

President Trump eyiela egwu ịbụgo tariffs n’ebe ọdị ukwu gara mba Russia ma ọ bụrụ na ha ekweghi nwe nkwekorita ịkwụsi agha dị n’etiti ha na mba Ukraine.

President Trump gara n’iru mee ka amata na otu ndị agha abụọ ozigara mba Russia dika ya na nwa amadi ahụ jibu ọkwa onye isi ala mba Russia bu former President Dmitry Medvedev nwechara mkparitauka n’ụwa ozi, ka nọ ebu ahụ k’ọdị ugbua, na agbanyeghị na okwuputaghi mpaghara ndị agha ahụ nọ.

Nkea na abịa dika ọ katọrọ etu mba Russia sị ebu agha emegide mba Ukraine, dịka mba Russia wakporo ụlọ ebe obibi ndị mmadụ ka Kyiv bu isi obodo mba Ukraine ma gbuo mmadụ iri atọ na otu n’ụbọchi Thursday gara aga.

Dika agha ahụ na aga n’iru n’etiti mba abụọ a, ndị ọrụ sitere mba Russia nakwa mba Ukraine, enwela ọtụtụ nzukọ n’ọnwa ole mole na ọdị nso na Istanbul dị na mba Turkey.

Onye isi mba Ukraine bu President Volodymyr Zelenskyy mere ka amata ụnya bu Sunday na nzukọ ikpeazụ ha mere na ha nwere nkwekọrịta itọghapụ mmadụ otu puku na narị abụọ ndị eji-eji.

Dika onye ozi pụrụ iche, Witkooff nochitakeara anya President Trump, na mkparitauka dị n’etiti mba Israel na Hamas dị na mba Palestine, dika osi etu ahụ mee njem nkpọturu ga Tel Aviv dị na mba Israel n’ụbọchi Saturday bu ebe ozutara ezinụlọ ndị ahụ eji-eji na Gaza dị na mba Palestine.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited