Onye isi oche ụlọ nzukọ ukwu Senate ala anyi, ekwuputala obi nwute ya gbasara ọnwụ Late Chief Audu Ogbeh.

Written by on August 11, 2025

Onye isi oche ụlọ nzukọ ukwu Senate ala anyi bu Senator Godswill Akpabio ekwuputala obi nwute ya gbasara ọnwụ nwa amadi ahụ jibu ọkwa onye isi oche otu ndọrọndọrọ Peoples Democratic Party PDP ma bụrụkwa onye jibu ọkwa Minister of Agriculture and Rural Development bu Late Chief Audu Ogbeh.

N’ozi putara ihe site n’aka onye enyemaka ya pụrụ iche n’ihe gbasara ozi bu Eseme Eyiboh, mere ka amata na Senator Akpabio kọwara nwa amadi ahụ dika onye biri ezigbo ndụ ma tinyekwa oke nke ya na mmepe ala anyi.

Dika o ji aha ezinụlọ ya, ndị ọ na anọchite anya ha nakwa ụlọ ukwu Senate ala anyi na akasi ezinụlọ Late Chief Audu Ogbeh, government Benue State, ụmụ afọ State ahụ nakwa ndị otu ndọrọndọrọ All Progressive Congress APC obi maka yabu ọnwụ.

Senator Akpabio gakwara n’iru riọ Chukwu Okike Abiama ka onye ezinụlọ Late Chief Audu Ogbeh obi ndidi ha ga eji diye yabu ọnwụ ma nyekwa ya ebe ezumike ebebe.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited