Onye nnọchiteanya obodo Vatican na mba South Sudan arịọla mba ahụ ka nabata udo ma tinye mma ha nọbo dịka ihe ha jiri kwanyere Pope Francis lagoro mmụọ ugwu ikpeazụ.

Written by on April 28, 2025

Onye nnọchiteanya obodo Vatican na mba South Sudan agwala otu na ama gọọmenti aka n’ihu na mba ahụ ka ha kwụsị ọgba aghara ahụ dị kemgbe ka ọ bụrụ otu ihe ha jiri kwanyere pope Francis lagoro mmụọ ugwu ikpeazụ.

Archbishop Seamus Patrick Horgan kwuru na mba South Sudan bụ ndị otu obodo dịrị Pope Francis na nsọ oge ọ nọ ndụ bụkwa nke ọ bụ ebumnuche ya ịnọ ndụ hụ na udo chịrị eze ọzọ na mba ahụ.

Pope nọrọ n’oge o mere njem ya gaa na mba South Sudan dị na ọwụwa anyanwụ ala ndị isi ojii n’afọ 2023 rịọ otu abụọ ahụ na ama onwe ha aka n’ihu ka ha jisi ike chọọ udo ga-adị ọkpụ tara ọkpụ maka ọdịmma nke ụmụ afọ ha.

Ọgbaghara tasuru ọhụrụ na mba ahụ emela ka ububo udo akpara n’afọ 2018 ka alụchara agha ndị nkịtị na mba ahụ bụrụ nke kpụrụ afọ n’ala.

Archbishop Horgan kwuru na arịrịọ nke pope nọrọ n’oge ahụ rịọ ka dịkwa ire ma bụrụkwa nke ga amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na ha tinyere ya n’ọrụ ugbua pope n’onwe ya bugoro onye nwụrụ anwụ.

Nnukwute onye ụkọ Chukwu ahụ kwuru nkea n’oge o sonyere na àjà misa a chụrụ na ụlọ St Theresa cathedral dina obodo Cuba bu isi ọchịchị nke mba South Sudan n’ụbọchị Friday gara aga.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited