Onye ọkaiwu ndị otu Indigenous People of Biafra IPOB akpọkuola onye isi ala anyi ka oweputa ezi ọnọdụ ka mma iji tinye ọnụ gbasara ajọ ọnọdụ ana ahuta kwa ụbọchị.
Written by Onyinye on April 22, 2025
Onye ọkaiwu ndị otu Indigenous People of Biafra IPOB bu Ifeanyi Ejiofor, anọrọla taata bu Monday kpọkuo onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu ka oweputa ezi ọnọdụ ka mma iji tinye ọnụ gbasara ajọ ọnọdụ ana ahuta kwa ụbọchị bu ndi ana enyo enyo na ha bu ndi n’achi efi na emegasi na gburugburu ala anyi a.
Ejiofor mere ka nkea puta ihe n’oge ọ na agwa ndị nta akụkọ okwu na Owerri bu isi obodo State ahụ gbasara mwakpo ana emegasi n’obodo dị iche iche na ala anyi a.
Ọ kwụsịrị ike na mkpa ọ dị na government etiti nakwa nke State weputara ezi atụmatụ iji chekwaba ndu ndi mmadụ nakwa ihe ha nwere, ọ gara n’iru kwuo na ndi obodo nwekwara oke ha iji chekwaba onwe site n’ụzọ iwu kwadoro.
N’okwu ya, Ejiofor mere ka amata na ala anyi a bu Nigeria na agabiga nsogbu na mpaghara dị iche iche ndi gụnyere, Plateau, Benue, Enugu nakwa Delta States, bu nke na ewetara obodo ndị a ọdachi dị egwu.
Ọkwụsịrị ike na ajọ ọnọdụ nwakpo a bu nke metutagoro ụtụtụ ndị mmadụ ndị gụnyere ndị Nne, ndi Nna, ụmụaka, ndị bu ha ji ezinụlọ ha nakwa ndị nke tufugoro ndụ ha n’ike.
Ọ gwara obodo ọbula ka ha mụrụ anya ka azụ ma mgba mbọ hụ na ha na echekwaba onwe ha n’ụzọ iwu kwadoro, dika ọ na akpọku ndi nchekwa ka ha lebara anya na mkpesa ndi mmadụ na ekpesara ha gbasara mwakpo ana eme ha n’ike.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.