Onye Prime Minister nke mba India kwupụtara obi nwete ya banyere ọnwụ Late Former President Muhammadu Buhari.
Written by Onyinye on July 14, 2025
Onye Prime Minister nke mba India bu Mazi Narendra Modi, ekwuputala obi nwute ya banyere ọnwụ nwa amadi ahụ jitọpụrụ ọkwa onye isi ala anyi bu Nigeria bu Late Former President Muhammadu Buhari, ebe ọ kọwara ya dika ezigbo onye ọchịchị nakwa onye na akwalite udo na ịdị n’otu.
N’ozi nkasi obi oweputara n’ụwa ozi ya taata bu Monday, Modi kwuru na ọ gaghị echefu nzukọ nakwa mkparitauka ya na Late Former President Buhari nwere, ọ gara n’iru kwupụta ezi amamihe ya, ihunanya ya nakwa mbọ ogbara iji hụ na mba India nakwa ala anyi bu Nigeria nwere ezi mmekọrịta.
Ọ kasịrị ezinụlọ ya, government ala anyi a nakwa ụmụ afọ Nigeria n’izugbe ya obi maka yabụ ọnwụ Late Former President Muhammadu Buhari, dika ọ kpere ekpere ka mkpuru obi ya zuru ike na ndukwa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.