Opekatampe mmadụ ise nwụnyuru anya piii n’oge ụgbọala opi ike bụ trailer nke bu akpa ntụ Cement hapụrụ okporo ụzọ ma gbaba n’otu ụlọ obibi dị na Nnewi nke Anambra Steeti

Written by on February 17, 2025

Opekatampe mmadụ ise nwụnyuru anya piii n’oge ụgbọala opi ike bụ trailer nke bu akpa ntụ Cement hapụrụ okporo ụzọ ma gbaba n’otu ụlọ obibi dị na Nnewi nke Anambra Steeti n’ụbọchị Friday oge ana eme emume Valentine.

Anya hụrụ ka ihe siri mee kwuru na ọ bụ n’akụkụ police area Command headquarters dị na Nnewi ka ya bụ ihe mere.

N’otu ihe onyonyo viral video na agagharị na ọwa ozi ka ahụrụ ozu ụmụaka na nke ndị okenye bụ ndị nwụrụ n’oge ihe mberede ahụ tinyere ya bụ ụlọ obibi nke ụgbọala lagoro n’iyi.

Ahụkwara otu nwaanyị ka ọ na akwa ákwá bụ onye e kwuru na ụmụaka ya mmadụ abụọ nwụrụ n’ihe mberede ahụ mere n’oge mgbede mgbe ndị mmadụ malitegoro Ị merube mmemme ụbọchị ịhụnanya ahụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Subscribe

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited