Otu Ndorondoro ADC Ajula Mkpebi Ohuru INEC Jiri Kachapu Aha Ndi Nchikwa Yabu Otu Ndorondoro Na Ogogo Etiti
Written by admin on April 2, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu ndorondoro African Democratic Congress ADC ajula ihe ha kowara dika ajo nkowa ulo olu Independent National Electoral Commission INEC megide nkabi ikpe ulo ikpe mkpeghari Court of Appeal nyere banyere onodu ndi nchikwa yabu otu ndorondoro.
Nke a putara ihe na uhuruchi unya bu Wednesday na Abuja site na ozi ode akwukwo mgbasa ozi na izugbe ya na okwa National Publicity Secretary yabu otu ndorondoro bu Bolaji Abdullahi nyefere ndi nta akuko.
Na ozi a ka otu ndorondoro ADC noro boo ebubo sina ulo olu INEC na aruzikwa olu na ntuzi aka sitere ebe ozo.
Ozi meziri ka amata na INEC noro na mbu kachapu aha Sen David Mark dika onye isi izugbe na okwa National Chairman nakwa aha nke Ogbeni Rauf Aregbesola dika ode akwukwo izugbe National Secretary yabu otu ndorondoro ADC.
INEC kowara nke a dika inwe nrube isi na nkabi ikpe sitere na ulo ikpe mkpeghari megide onodu ndi nchikwa yabu otu ndorondoro.
Ka osiladi, na ozi nke ahu Bolaji Abdullahi nyefere ndi nta akuko na uhuruchi unya ka otu ndorondoro ADC noro kowa omume ulo olu INEC dika nke nruru aka ma burukwa nke na agbasoghi nkabi ikpe sitere na ulo ikpe.
Abdullahi boro ebubo sina yabu ulo olu ntule aka ochichi ala anyi esonyegoro na ikpe mara eziokwu dika osiri metuta onodu a.
Okowaziri na ndi otu ndorondoro ADC na atuzi atumatu ihe ha ga eme megide mkpebi a ulo olu INEC nwere.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.