otu onye osi nri na ala anyi emela ka amata na ya choro ka aha ya banye na akwukwo ndeko world Guinness record dika onye izizi ga esi ite nri kacha buo ibu na Nigeria.
Written by Onyinye on August 25, 2025
Otu onye osi nri na Nigeria amara dika Hilda Baci emela ka amata na ya choro ka aha banye na akwukwo ndeko world Guinness record dika onye izizi siri ite nri kacha buo ibu na elu uwa.
Yabu onye osi nri mere ka nke a puta ihe na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ohaneze ya nwanne unya bu Friday.
Nwada Bacci gakwara na iru wee kowa na yabu nri ka ya ga esi na ite ogologo ya ga adi ntu meter isii, ebe obosara ya ga adikwa ntu meter isii yabu six meter wide by six meter high ma asughari na asusu beeke.
Iga echetazi na nwada Bacci ka aha ya banyere na akwukwo ndeko world Guinness record na onwa June afo 2023 dika onye kacha wee sie nri na akwusighi akwusi bukwanu nke omere site na isi nri hour iri iteolu na ato nakwa nkeji iri na otu, 93 hours 11minutes.
Na ikpazu ka omere ka amata na nke a bu afo abuo ya noo wee na eche ihe ya ga eme ozo nke ga abanye na akwukwo ndeko world Guinness record, ma kwuputa na yabu nwele isi ite nri kacha buo ibu ga ewere onodu na onwa iteolu nke afo a bu 2025 na Muri Okunola park , Victoria lsland nke Lagos State.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.