Otu United Nations ahutala mpaghara Gaza’s strip dika ebe ana egbu mmadu aghara aghara.
Written by Onyinye on April 9, 2025
Onye isi oche n’ okwa chief nyere otu United Nations UN bu Antonio Guterres emela ka amata na mpaghara Gaza’s strip nke mba Palestine aghola ebe ana egbu mmadu aghara aghara dika ndi agha mba Israel kana agakwa n’ iru na agbariko mpaghara ahu ma gbuo opekata mpe mmadu iri abuo na isii bu umuafo mba Palestine unya bu Tuesday.
Ndi dibia oyibo n’ enweghi ebe obibi (MSF) mere ka amata na mwakpo ahu mba Israel mere metutara ulo olu alu Ike ha bu nke di na mpaghara mawasi na Gaza.
N’ aka nke ozo ka nnyocha n’ egosikwa na ndi agha mba Israel ji ogbu n’ igwe gbarisia ulo ebe ana esi nri enye m aka di na mpaghara Khan younis nwanne unya bu Monday.
Mba US nokwara n’ otu aka ahu jiri ogbunigwe agbari mpaghara Yemen ma gbuo opekata mpe mmadu isii na hodeidah ,ebe ndi agha mba Israel butegoro ugbo elu ohuru ha ga eji buo agha gara mpaghara Baalbek na Bekaa valley nke mba Lebanon.
Ndi olu aru Ike mpaghara Gaza mere ka amata na opekata mpe ya buru mmadu di puku ise na nari asato na iri bu umu afo mba Palestine nwugoro anwu ebe ndi nwetara ihe mmeru aru di mmadu otu nari puku na iri na ise, nari isii na iri asato na asato site n’ agha ahu mba Israel buru banye mpaghara Gaza’s strip.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.