Otutu mmadu anwuola site na mmachi ahu President Donald Trump machiri nkwado enyemaka aru Ike mbuwa.
Written by Onyinye on April 9, 2025
Mmadu asato tinyekwara umuaka ise anwuola dika ha ji ukwu ga njem ihe kariri hour ato n’ oke anwu, bu ebe ha n’ acho ebe ana anata ogwugwo oria ogbugbu na onyunyu akporo cholera na mpaghara South Sudan, dika ndi enyemaka nke mba United States nyegoro ulo olu aru Ike digasi na Obodo ahu ikikere ka ha mechisia.
Otu enyemaka mbuwa maka izoputa umuaka bu ndi nke ji mba America mere onodo noro tata bu Wednesday weputa ozi banyere ndi nwuru anwu n’ onwa gara aga ma n’ akowakwa,na ulo olu ha so na ndi izizi President Donald Trump n’ achi mba America kwusiri olu site n’ atumatu ahu ojiri kagbuo inye nkwado enye m aru Ike gara mbuwa oge ahu iweghara okwa ochichi n’ abali iri abuo nke onwa January afo a.
Iga echeta na otu enyemaka a akporo save the children noburi kemgbe n’ akwado ulo olu aru Ike di iri abuo na asaa na mba South Sudan tupu mba US anoro n’ ‘afo a nye ikikere ka ha mechie nke mere otutu ndi mmadu ha noro n’ onodo enweghi olu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.