Otutu Ndi Mmadu Akatola Nkusu Ahu Emegara Mazi Peter Obi Nakwa Ndi Ozo Na Edo State

Written by on February 26, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otutu ndi mmadu nakwa otu di ichiche agala na iru na akato nkusu ahu ndi oji egbe eri megara onye ahu ji okoloto otu ndorondoro Labour Party zoo okwa onye isi ala Nigeria na afo 2023 bu mazi Peter Obi nakwa onye ahu jiburu okwa National Chairman otu ndorondoro All Progressives Congress APC bu Chief John Odigie-Oyegun gunyere ndi ozo sitere otu ndorondoro African Democratic Congress ADC na Benin City bu isi obodo Edo State.

Iga echeta na obu nwanne unya bu Tuesday ka habu ndi oji egbe eri wakporo ndi a na bee Chief Odigie-Oyegun oge ha sitere ogbako were onodu na ogige isi ulo olu ADC Secretariat dina Benin City nata.

Na okwu ya unya bu Wednesday ka onye ahu ji okoloto otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP zoo okwa onye isi ala na afo 2023 ma buru onye jiburu okwa osote onye isi ala anyi bu Alhaji Atiku Abubakar katoro nkusu a ma kowa ya di ihe aka mgba megide ochichi onye kwuo uche ya.

Na nke ya ka Gov Monday Okpebholo na achi yabu Edo State katokwuru yabu nkusu ma kwuputa na onweghi iwe na onuma banyere okwe ndorondoro kwesiri ibute ogbaghara.

Na aka nke ha ka otu mgbaziri jikoro otu ndorondoro ochichi niile enwere na ala anyi akporo Inter Party Advisory Council IPAC kporo oku ka eme ngwangwa nwuchiko ma kpuga ndi niile aka ha dina yabu nkusu na ulo ikpe, ebe otu ndorondoro PDP na Edo State sitere na ozi ode akwukwo mgbasa ozi ha bu Dan Osa-Ogbegie binyere aka tie mkpu na oke olu sina achoro imunye oku ojo megide otu ndorondoro na amagasi nke nona isi ugbo ochichi aka na iru.

Otu ndorondoro ADC noziri na aka nke ya site na onu ode akwukwo mgbasa ozi ha na izugbe na okwa National Publicity Secretary bu Malam Bolaji Abdullahi kwuputa na obu ndi gunyere: mazi Peter Obi, Chief John Odigie-Oyegun nakwa Barr Olumide Akpata ka aturu atumatu inapu ndu ha na ike na nkusu ahu.

Malam Abdullahi gwara ndi nta akuko na otu ndorondoro ADC ga akpuga otu ndorondoro APC ulo ikpe ECOWAS Court maka ihe a oboro ebubo sina obu agha nkusu ndorondoro political terror sitere na aka yabu otu ndorondoro APC.

Ndi ozo kwugoro okwu nkato megide nkusu a gunyere: Sen Natasha Akpoti-Uduaghan, otu Obidient Movement, nke Delta Democrats Forum, otu Neo African Centre, nakwa otutu ndi ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited