Otutu Ndi Mmadu Anwuola Na Ihe Mgbawa Mere Na Ogige Ebe Onodu Ndi Agha Mba Burundi
Written by admin on April 2, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi agha mba Burundi emela ka amata na opekata mpe mmadu iri na ato tufuru ndu ha na ike na ihe mgbawa mere na ogige ebe onodu ndi agha military base mba ahu dina mpaghara Bujumbura bukwanu isi onodu azum ahia yabu mba dina owuwa anyanwu ala isi oji East Africa.
Habu ndi agha mba Burundi kowaziri na mmadu iri ise na asaa nwetara ihe mmeru aru di ichiche na ihe mgbawa ahu.
Ndi agha ahu gwara ndi nta akuko na yabu ihe mgbawa mere site na akuru ngwa oku electrical short circuit dina mpaghara ogige ebe onodu habu ndi agha.
Odachi a gakwara na iru bie aka ojo na otutu ulo nakwa ugboala ndi nkiti.
Na okwu ya unya bu Wednesday ka onu na ekwuru ndi agha Burundi Army bu Gen Gaspard Baratuza mere ka amata na ihe mgbawa a mebisiri akuru ngwa nakwa ogige ndi agha dika oji oku ogbugba repia ha.
Gen Baratuza enweghi ka osiri nye nkowa na ozuzu oke ma ndi agha soldiers ha sona ndi ahu odachi a napuru ndu ha na ike.
Ka osiladi, okowaziri na mmadu ato na ime habu ndi agha sona ndi nke ahu nwetara ihe mmeru aru.
Ndi nta akuko nwetara ozi na obu na abali nwanne unya bu Tuesday ka yabu ihe mgbawa mere na ogige ebe ndosa ngwa ogu Main Ammunition Depot nke usuu ndi agha Burundi National Defence Force dina Musaga nke ndida ugwu mpaghara Bujumbura.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.