Ọtụtụ n’ime ndị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala n’ala anyị ebugola ọnụ ahịa nke ana ere otu ntụ lita fuel.
Written by Onyinye on June 24, 2025
Ọtụtụ n’ime ndị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala n’ala anyị ebugola ọnụ ahịa nke ana ere otu ntụ lita fuel ihe ruru ugboro abụọ n’ime otu izu ụka.
Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ụfọdụ ọdụ mmanụ ụgbọala nke gụnyere Empire Energy filing station, Ranoil yana ọtụtụ ndị ọzọ na Abuja nọrọ n’izu gara aga kpatu aka ugboro abụọ na ego ole ha na-ere mmanụ ahụ amara dịka Premium Motor Spirit PMS.
Empire filling station di na mpaghara Gwarimpa buru ụzọ si na narị itoolu na naira iri ₦910 bugo ya ka ọ bụrụ ₦955 kwa otu lita.
Ebe ogbo ya bụ Ranoil dịkwa na Gwarimpa, Kado yana Lugbe petrol si na ₦905 bulie nke ha ka ọ bụrụ ₦935 ụnyaahụ bụ Monday.
Dangote na Mrs oil na ere nke ha n’agbata ₦925 ruo ₦945 na Lagos State yana Abuja.
Ebe NNPCL na ere n’agbata ₦915 ruo ₦945 na Lagos na Abuja.
N’okwu ya banyere ihe kpatara ọnọdụ a ka onye President nke otu Independent Petroleum marketers associations bu Abubakar Maigandi kwuru na ọ agha ahụ na-ada n’etiti mba Israel na Iran kpatara ya. Kworo maka nke ahụ anọrọla n’ụtụtụ ụnyaahụ bụ Monday mee ka ọnụ ahịa ana ere mmanụ agbidi bụ crude oil jiri percent atọ gbagoo na mba ụwa niile.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.