President mba United Kingdom amachiela ego enye m aka gara ndi oria nakwa ndi n’ enweghi k’ ora ha na mba ahu

Written by on March 19, 2025

Onowu n’ okwa Prime Minister mba United Kingdom bu Sir Keir Starmer ekwuputala mmachi omachiri ego eji ebeletara ndi oria ogwugwo ma n’ akowa na ego ana emefu n’ atumatu ahu n’ ebizi ego ohaneze aka ojo.

Mmachi a ochichi ya machiri elele a ndu oria nakwa ndi nwere nkwaru n’ erite bu unya bu Tuesday ka emere ya ebe otutu ndi ministers n’ ekwu si na ebu m n’ obi ya bu ijikwanata ego ruru ijeri Euro ise n’ ‘afo 2030 ma n’ agbakwa ndi mmadu ume idi n’ arusi olu Ike dika ha n’ enyere ndi n’ enweghi k’ Ora ha aka.

N’ oge ona agwa ndi nta akuko okwu ka Sir Keir Starmer mere ka amata na ochichi di ugbua adighizi njikere imefu ego n’ isi ndi oria n’ udi obula

Atumatu a ochichi Sir Keir Starmer weputara ka otutu otu enyemaka di iche iche katosiri Ike ma n’ akowa na nkea nwere Ike ikwanyekwu otutu ndi n’ enweghi k’ora ha n’ Ajo onodu ubiam onu ntu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited