President Volodymyr Zelensky na-achị mba Ukraine ekwuola sị na ụbụbọ udo ọbụla mba United States yana Russia n’akpa n’etinyeghi obodo ha bụ Ukraine agaghị amịta mkpụrụ ọbụla.
Written by admin on February 14, 2025
Ọchịchị mba Ukraine ekwuola na ha agaghị anabata ụbụbọ udo ọbụla nke mba Russia yana United States n’akpa na-emeghi ka ha sonyere na ya. Nkea na-abịa dịka President Donald Trump nke mba United States yana ogbo nke mba Russia bụ Vladimir Putin kwechara nkwa sina ha ga amalite ịkpa etu udo ga-esi chịa eze ọzọ n’etiti obodo abụọ ahụ.
Trump kwuru na olileanya dị n’udo ga emecha chịa eze ọzọ ngwa ngwa yana President Putin nwechara mkparịta ụka nke were ọtụtụ oge site n’oku ekwe ntị.
N’oge ahụ ka ogbo ha na achị mba Ukraine bụ President Zelensky kwuru na ụbụbọ udo ọbụla akpara na etinyeghi mba Ukraine agaghị amịta mkpụrụ ọbụla.